15. n'ihi na Chineke ekworo ka Jehova, bú Chineke-gi, bu n'etiti gi; ka iwe Jehova, bú Chineke-gi, we ghara idi ọku megide gi, O we kpochapu gi n'elu ala.
16. Unu anwala Jehova, bú Chineke-unu, dika unu nwara Ya nime Masa.
17. Unu gējisi ike idebe ihe ahu nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, unu gēdebe kwa ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke O nyeworo gi n'iwu.
18. I gēme kwa ihe ziri ezi na nke di nma n'anya Jehova: ka o we diri gi nma, ka i we ba kwa, nweta ezi ala ahu, nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi inye ha,