26. emewom ka elu-igwe na uwa b͕agide unu àmà ta, na unu gālapusi n'iyì ngwa ngwa n'ala ahu nke unu nāgabiga Jọdan ibà n'ebe ahu inweta ya; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ya, kama agēkpochapu unu ekpochapu.
27. Jehova gēme kwa ka unu b͕asa n'etiti ndi nile, unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole n'etiti mba nile ọzọ, ebe Jehova gēduga unu.
28. Unu gēfè kwa chi n'ebe ahu, ndi bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume, nke nādighi-ahu uzọ, ha adighi-anu kwa ihe, ha adighi-eri ihe, ha adighi-anu kwa ísì.
29. Ma asi na i si n'ebe ahu chọ Jehova, bú Chineke-gi, i gāchọta kwa Ya, mb͕e i were obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile jua ase Ya.
30. Mb͕e nkpab͕u diri gi, mb͕e ihe nile ndia abiakwasiwo-kwa-ra gi, na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia i gālaghachikuru kwa Jehova, bú Chineke-gi, ge kwa olu-Ya nti: