Deuteronomi 34:3-12 Bible Nso (IGBOB)

3. na Negeb, na Buruburu-ala nke ndagwurugwu Jeriko, bú obodo nkwu, rue Zoa.

4. Jehova we si ya, Nka bu ala ahu nke M'ṅuru Abraham iyi, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, si, Ọ bu nkpuru-gi ka M'gēnye ya: emewom ka i were anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-agabiga n'ebe ahu.

5. Moses, bú orù Jehova, we nwua n'ebe ahu n'ala Moab, n'okwu-ọnu Jehova.

6. O we lìe ya na ndagwurugwu ahu n'ala Moab na ncherita-iru Bet-peoa: ma ọ dighi onye mara ílì-ya rue ta.

7. Moses b͕ara ọgu arọ isi mb͕e ọ nwuru: anya-ya adighi-ahu inyoghi-inyoghi, ume-ya apughi n'aru-ya.

8. Umu Israel we kwara Moses ákwá n'ala ihe nādighi nke Moab orú ubọchi na iri: ubọchi nile nke ikwa-ákwá, bú oruru-újú Moses, we zue.

9. Joshua nwa Nun we juputa na mọ nke amam-ihe; n'ihi na Moses ebikwasiwo ya aka-ya abua: umu Israel we ge ya nti, me kwa dika Jehova nyere Moses iwu.

10. Ọ dighi kwa onye-amuma biliri ọzọ n'Israel dika Moses, onye Jehova mara iru na iru;

11. bayere ihe-iriba-ama nile na ihe-ebube nile, nke Jehova zigara ya ime n'ala Ijipt, ime Fero, na ime ndi-orù-ya nile, na ime ala-ya nile;

12. baye-kwa-ra aka ahu di ike nile, baye-kwa-ra ihe egwu uku ahu nile, nke Moses mere n'anya Israel nile.

Deuteronomi 34