Deuteronomi 34:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Moses we si n'ala ihe nādighi nke Moab rigorue ugwu Nebo, rue elu Pisga, nke di n'iru Jeriko. Jehova we me ka ọ hu ala ahu nile; Gilead, rue Dan;

2. na Naftali nile, na ala nke Efraim na Manase, na ala nile nke Juda, rue oké osimiri nke di n'azu;

3. na Negeb, na Buruburu-ala nke ndagwurugwu Jeriko, bú obodo nkwu, rue Zoa.

4. Jehova we si ya, Nka bu ala ahu nke M'ṅuru Abraham iyi, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, si, Ọ bu nkpuru-gi ka M'gēnye ya: emewom ka i were anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-agabiga n'ebe ahu.

5. Moses, bú orù Jehova, we nwua n'ebe ahu n'ala Moab, n'okwu-ọnu Jehova.

6. O we lìe ya na ndagwurugwu ahu n'ala Moab na ncherita-iru Bet-peoa: ma ọ dighi onye mara ílì-ya rue ta.

7. Moses b͕ara ọgu arọ isi mb͕e ọ nwuru: anya-ya adighi-ahu inyoghi-inyoghi, ume-ya apughi n'aru-ya.

8. Umu Israel we kwara Moses ákwá n'ala ihe nādighi nke Moab orú ubọchi na iri: ubọchi nile nke ikwa-ákwá, bú oruru-újú Moses, we zue.

Deuteronomi 34