Deuteronomi 32:7-11 Bible Nso (IGBOB)

7. Cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga,Ghọta arọ nke ọtutu ọb͕ọ:Jua nna-gi, ọ gēgosi kwa gi;Jua ndi-okenye-gi, ha gāgwa kwa gi.

8. Mb͕e Onye kachasi ihe nile elu mere ka mba nile keta ihe-ha,Mb͕e O kesara umu madu,O guzoro ókè nile nke ndi nileDika ọnu-ọgugu umu Israel si di.

9. N'ihi na òkè Jehova bu ndi-Ya;Jekob bu akuku ihe-nketa-Ya.

10. Ọ chọtara ya n'ala ọzara,Na n'ihe tọb͕ọrọ nkití, bú ala tọb͕ọrọ n'efu nke nāb͕ọ uja.Ọ nāb͕a ya buruburu, Ọ nēme ka ọ ghọta ihe,Ọ nēchezi ya dika nwantanta anya-Ya:

11. Dika ugo nākpọte umu di n'akwu-ya,Nērughari n'elu umu-ya,Nāb͕asa nkù-ya, nāghọrọ ha,Nēbu ha n'elu nkù-ya:

Deuteronomi 32