Deuteronomi 32:41-52 Bible Nso (IGBOB)

41. Ọ buru na amuam mma-agham nēb͕upu àmùmà,O buru kwa na akam ejide ikpé;M'gābọghachi ọ́bọ̀ n'aru ndi nēmegidem,M'gākwughachi kwa ndi nākpọm asi.

42. M'gēme ka àkúm nile ṅubiga ọbara okè,Mma-agham gēri kwa anu-aru;Site n'ọbara ndi eb͕uru eb͕u na ndi adọtara n'agha,Site n'isi ndundu onye-iro.

43. Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya ti nkpu ọṅu:N'ihi na Ọ gābọ̀ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya,Ọ́bọ̀ ka Ọ gābọghachi kwa n'aru ndi nēmegide Ya,O gēkpuchi kwa nmehie ala-Ya na ndi-Ya.

44. Moses we bia, kwue okwu nile nke abù a na nti ndi Israel, ya onwe-ya, na Hoshea nwa Nun.

45. Moses we gwabìe Israel nile okwu nile ndia:

46. o we si ha, Tukwasi obi-unu n'okwu nile nke mu onwem nāb͕ara unu àmà ta; nke unu gēnye umu-unu n'iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a.

47. N'ihi na ọ bughi ihe efu ka ọ bu n'ebe unu nọ; n'ihi na nka bu ndu-unu, ọ bu kwa ihe a ka unu gēwere me ka ubọchi-unu di anya n'elu ala, ebe unu onwe-unu nāgabiga Jọdan inweta ya.

48. Jehova we gwa Moses okwu n'otù ubọchi ahu, si,

49. Rigo n'ugwu a nke Abarim, bú ugwu Nebo, nke di n'ala Moab, nke di n'irú Jeriko; le kwa ala Kenean anya, bú nke Mu onwem nēnye umu Israel n'ihe-onwunwe:

50. gi nwu kwa n'ugwu ahu ebe i nārigo, ka achikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ; dika Eron, bú nwa-nne-gi, nwuru n'ugwu Hoa, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ:

51. n'ihi na unu mekpuru ihe-nmekpu megidem n'etiti umu Israel na miri Meriba Kedesh, n'ọzara Zin; n'ihi na unu edoghm nsọ n'etiti umu Israel.

52. N'ihi na ọ bu na ncherita-iru ka i gāhu ala ahu; ma i gaghi-abà n'ebe ahu n'ala ahu nke Mu onwem nēnye umu Israel.

Deuteronomi 32