40. N'ihi na anameweli akam elu nye elu-igwe,We si, Mu onwem nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi,
41. Ọ buru na amuam mma-agham nēb͕upu àmùmà,O buru kwa na akam ejide ikpé;M'gābọghachi ọ́bọ̀ n'aru ndi nēmegidem,M'gākwughachi kwa ndi nākpọm asi.
42. M'gēme ka àkúm nile ṅubiga ọbara okè,Mma-agham gēri kwa anu-aru;Site n'ọbara ndi eb͕uru eb͕u na ndi adọtara n'agha,Site n'isi ndundu onye-iro.
43. Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya ti nkpu ọṅu:N'ihi na Ọ gābọ̀ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya,Ọ́bọ̀ ka Ọ gābọghachi kwa n'aru ndi nēmegide Ya,O gēkpuchi kwa nmehie ala-Ya na ndi-Ya.
44. Moses we bia, kwue okwu nile nke abù a na nti ndi Israel, ya onwe-ya, na Hoshea nwa Nun.
45. Moses we gwabìe Israel nile okwu nile ndia:
46. o we si ha, Tukwasi obi-unu n'okwu nile nke mu onwem nāb͕ara unu àmà ta; nke unu gēnye umu-unu n'iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a.