36. N'ihi na Jehova gēkpeputa ndi-Ya,Cheghari kwa ncheghari bayere ndi-orù-Ya;Mb͕e Ọ nāhu na ihe-iye-aka-ha alawo,Ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọbu onye arapuru arapu fọduru.
37. Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ?Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya;
38. Nke nēri abuba àjà nile ha,Nāṅu kwa manya-vine nke àjà-ihe-ọṅuṅu-ha;Ka ha bilie, yere unu aka,Ka ọ buru ebe-nzuzo n'elu unu.
39. Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya,Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ:Mu onwem nēme ka anwua, M'nēme kwa ka adi ndu;M'tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike:Ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam.
40. N'ihi na anameweli akam elu nye elu-igwe,We si, Mu onwem nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi,
41. Ọ buru na amuam mma-agham nēb͕upu àmùmà,O buru kwa na akam ejide ikpé;M'gābọghachi ọ́bọ̀ n'aru ndi nēmegidem,M'gākwughachi kwa ndi nākpọm asi.
42. M'gēme ka àkúm nile ṅubiga ọbara okè,Mma-agham gēri kwa anu-aru;Site n'ọbara ndi eb͕uru eb͕u na ndi adọtara n'agha,Site n'isi ndundu onye-iro.
43. Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya ti nkpu ọṅu:N'ihi na Ọ gābọ̀ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya,Ọ́bọ̀ ka Ọ gābọghachi kwa n'aru ndi nēmegide Ya,O gēkpuchi kwa nmehie ala-Ya na ndi-Ya.
44. Moses we bia, kwue okwu nile nke abù a na nti ndi Israel, ya onwe-ya, na Hoshea nwa Nun.
45. Moses we gwabìe Israel nile okwu nile ndia:
46. o we si ha, Tukwasi obi-unu n'okwu nile nke mu onwem nāb͕ara unu àmà ta; nke unu gēnye umu-unu n'iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a.
47. N'ihi na ọ bughi ihe efu ka ọ bu n'ebe unu nọ; n'ihi na nka bu ndu-unu, ọ bu kwa ihe a ka unu gēwere me ka ubọchi-unu di anya n'elu ala, ebe unu onwe-unu nāgabiga Jọdan inweta ya.
48. Jehova we gwa Moses okwu n'otù ubọchi ahu, si,