33. Edide agwọ di ogologo ka manya-vine-ha bu,Na ńsí di irè nke aju-ala.
34. Ǹka abughi ihe akwakọbaworo n'ebe m'nọ,Ihe akaworo akàrà n'ulo-àkùm?
35. Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi,Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu:N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso,Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa.
36. N'ihi na Jehova gēkpeputa ndi-Ya,Cheghari kwa ncheghari bayere ndi-orù-Ya;Mb͕e Ọ nāhu na ihe-iye-aka-ha alawo,Ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọbu onye arapuru arapu fọduru.
37. Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ?Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya;
38. Nke nēri abuba àjà nile ha,Nāṅu kwa manya-vine nke àjà-ihe-ọṅuṅu-ha;Ka ha bilie, yere unu aka,Ka ọ buru ebe-nzuzo n'elu unu.
39. Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya,Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ:Mu onwem nēme ka anwua, M'nēme kwa ka adi ndu;M'tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike:Ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam.