25. Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí,Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile;Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke,Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ.
26. Asiwom, M'gāfupu ha,Me ka ncheta-ha kwusi n'etiti madu:
27. Ma ọ buru na atughm ujọ nkpasu-iwe onye-iro,Ka ndi nākpab͕u ha we ghara ichehie,Ka ha we ghara isi, Aka-ayi di elu,Ọ bughi Jehova meworo ihe a nile.
28. N'ihi na mba nke furu efu n'ebe idu-ọdu di ka ha bu,Nghọta adighi kwa nime ha.
29. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka,Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha!
30. Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri,Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga,Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha,Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ?
31. N'ihi na oké nkume-ha adighi ka Oké Nkume-ayi,Ndi-iro-ayi bu kwa ndi-ikpe.