24. Ha gābu ndi tara aru n'agu, na ndi nruru-ọku rub͕uworo,Ya na nbipu di ilu;Ezé anumanu ka M'gēzikwasi kwa ha,Ya na edide nke ihe nākpu akpu nke ájá.
25. Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí,Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile;Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke,Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ.
26. Asiwom, M'gāfupu ha,Me ka ncheta-ha kwusi n'etiti madu:
27. Ma ọ buru na atughm ujọ nkpasu-iwe onye-iro,Ka ndi nākpab͕u ha we ghara ichehie,Ka ha we ghara isi, Aka-ayi di elu,Ọ bughi Jehova meworo ihe a nile.
28. N'ihi na mba nke furu efu n'ebe idu-ọdu di ka ha bu,Nghọta adighi kwa nime ha.
29. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka,Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha!
30. Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri,Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga,Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha,Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ?
31. N'ihi na oké nkume-ha adighi ka Oké Nkume-ayi,Ndi-iro-ayi bu kwa ndi-ikpe.
32. N'ihi na ọ bu n'osisi vine nke Sọdọm ka osisi vine ha sitere,Site kwa n'ubi Gọmọra:Nkpuru-vine-ha bu nkpuru-vine ńsí,Uyọkọ di ilu ka ha nwere:
33. Edide agwọ di ogologo ka manya-vine-ha bu,Na ńsí di irè nke aju-ala.
34. Ǹka abughi ihe akwakọbaworo n'ebe m'nọ,Ihe akaworo akàrà n'ulo-àkùm?
35. Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi,Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu:N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso,Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa.
36. N'ihi na Jehova gēkpeputa ndi-Ya,Cheghari kwa ncheghari bayere ndi-orù-Ya;Mb͕e Ọ nāhu na ihe-iye-aka-ha alawo,Ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọbu onye arapuru arapu fọduru.
37. Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ?Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya;
38. Nke nēri abuba àjà nile ha,Nāṅu kwa manya-vine nke àjà-ihe-ọṅuṅu-ha;Ka ha bilie, yere unu aka,Ka ọ buru ebe-nzuzo n'elu unu.