Deuteronomi 32:22-33 Bible Nso (IGBOB)

22. N'ihi na amuyewo ọku n'iwem,Ọ nēre kwa rue ala-mọ nke dichasi ala,Ọ nēripia kwa uwa na ihe-ọmume-ya,Nēme kwa ka ntọ-ala nile nke ugwu nile nwuru ọku.

23. M'gēkpokwasi kwa ha ihe ọjọ;M'gāb͕apusi àkúm nile n'aru ha:

24. Ha gābu ndi tara aru n'agu, na ndi nruru-ọku rub͕uworo,Ya na nbipu di ilu;Ezé anumanu ka M'gēzikwasi kwa ha,Ya na edide nke ihe nākpu akpu nke ájá.

25. Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí,Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile;Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke,Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ.

26. Asiwom, M'gāfupu ha,Me ka ncheta-ha kwusi n'etiti madu:

27. Ma ọ buru na atughm ujọ nkpasu-iwe onye-iro,Ka ndi nākpab͕u ha we ghara ichehie,Ka ha we ghara isi, Aka-ayi di elu,Ọ bughi Jehova meworo ihe a nile.

28. N'ihi na mba nke furu efu n'ebe idu-ọdu di ka ha bu,Nghọta adighi kwa nime ha.

29. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka,Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha!

30. Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri,Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga,Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha,Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ?

31. N'ihi na oké nkume-ha adighi ka Oké Nkume-ayi,Ndi-iro-ayi bu kwa ndi-ikpe.

32. N'ihi na ọ bu n'osisi vine nke Sọdọm ka osisi vine ha sitere,Site kwa n'ubi Gọmọra:Nkpuru-vine-ha bu nkpuru-vine ńsí,Uyọkọ di ilu ka ha nwere:

33. Edide agwọ di ogologo ka manya-vine-ha bu,Na ńsí di irè nke aju-ala.

Deuteronomi 32