Deuteronomi 32:22-25 Bible Nso (IGBOB)

22. N'ihi na amuyewo ọku n'iwem,Ọ nēre kwa rue ala-mọ nke dichasi ala,Ọ nēripia kwa uwa na ihe-ọmume-ya,Nēme kwa ka ntọ-ala nile nke ugwu nile nwuru ọku.

23. M'gēkpokwasi kwa ha ihe ọjọ;M'gāb͕apusi àkúm nile n'aru ha:

24. Ha gābu ndi tara aru n'agu, na ndi nruru-ọku rub͕uworo,Ya na nbipu di ilu;Ezé anumanu ka M'gēzikwasi kwa ha,Ya na edide nke ihe nākpu akpu nke ájá.

25. Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí,Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile;Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke,Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ.

Deuteronomi 32