Deuteronomi 32:10-18 Bible Nso (IGBOB)

10. Ọ chọtara ya n'ala ọzara,Na n'ihe tọb͕ọrọ nkití, bú ala tọb͕ọrọ n'efu nke nāb͕ọ uja.Ọ nāb͕a ya buruburu, Ọ nēme ka ọ ghọta ihe,Ọ nēchezi ya dika nwantanta anya-Ya:

11. Dika ugo nākpọte umu di n'akwu-ya,Nērughari n'elu umu-ya,Nāb͕asa nkù-ya, nāghọrọ ha,Nēbu ha n'elu nkù-ya:

12. Otú a Jehova, nání Ya, nēdu ya,Ọ dighi kwa chi ala ọzọ diyere ya.

13. Ọ nēme ka ebe di elu nke uwa būru ya dika inyinya,Ọ we rie ihe-ọmume nke ubi;O me-kwa-ra ya ka ọ mia manu-aṅu site na nkume di elu,Na manu site n'oké nkume ọ́mú;

14. Miri-ara nke raru araru nke ìgwè ehi, na miri-ara nke ìgwè ewu na aturu,Ya na abuba umu-aturu,Na ebulu àb͕ọ̀ Beshan, na ewu,Tiyere abuba obi ọka wheat;Ọbara nkpuru-vine ka i nāṅu kwa, bú manya-vine.

15. Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu:I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi:O we rapu Chineke nke mere ya,We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.

16. Ha nēwere ndi ala ọzọ me ka O kwo ekworo,Ha nēwere ihe-árú di iche iche kpasue Ya iwe.

17. Ha nāchuru ndi-mọ ọjọ aja, ndi nābughi Chineke,Bú chi ha nāmaghi,Ndi ọhu ndi si n'ebe di nso bata,Ndi nna-unu-hà nātughi ujọ.

18. Oké Nkume ahu nke muru gi ka i nēchefu,I chezọwo kwa Chineke nke muputara gi.

Deuteronomi 32