4. ma Jehova enyeghi unu obi imara ama, na anya ihu ahu, na nti inu anu, rue ta.
5. Emewokwam ka unu je ije ọgu arọ abua n'ọzara: uwe-unu akapughi nká n'aru unu, akpukpọ-ukwu-gi akapughi nká n'ukwu-gi.
6. Ọ dighi achicha unu riworo, ọ dighi kwa manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya unu ṅuworo: ka unu we mara na mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
7. Unu we biarue ebe a, Saihon, bú eze Heshbon, na Og, bú eze Beshan, we puta izute ayi ibu agha, ayi we tib͕ue ha:
8. ayi we were ala-ha, were ya nye ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, n'ihe-nketa.
9. Debe-kwa-nu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, me kwa ha, ka unu we nwe uche n'ihe nile nke unu nēme.