Deuteronomi 29:2-13 Bible Nso (IGBOB)

2. Moses we kpọ Israel nile òkù, si ha, Unu onwe-unu ahuwo ihe nile nke Jehova mere Fero, me kwa ndi-orù-ya nile, me kwa ala-ya nile, n'anya-unu n'ala Ijipt;

3. ọnwunwa uku nile nke anya-gi huru, ihe-iriba-ama nile, na ihe-ebube uku ahu nile:

4. ma Jehova enyeghi unu obi imara ama, na anya ihu ahu, na nti inu anu, rue ta.

5. Emewokwam ka unu je ije ọgu arọ abua n'ọzara: uwe-unu akapughi nká n'aru unu, akpukpọ-ukwu-gi akapughi nká n'ukwu-gi.

6. Ọ dighi achicha unu riworo, ọ dighi kwa manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya unu ṅuworo: ka unu we mara na mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

7. Unu we biarue ebe a, Saihon, bú eze Heshbon, na Og, bú eze Beshan, we puta izute ayi ibu agha, ayi we tib͕ue ha:

8. ayi we were ala-ha, were ya nye ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, n'ihe-nketa.

9. Debe-kwa-nu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, me kwa ha, ka unu we nwe uche n'ihe nile nke unu nēme.

10. Unu onwe-unu nēguzo ta, unu nile, n'iru Jehova, bú Chineke-unu; ndi-isi-unu, na ebo nile unu, na ndi-okenye-unu, na ndi-odozi-okwu-unu, bú nwoke ọ bula nke Israel,

11. umu-ntakiri-unu, na ndinyom-unu, na ọbìa-gi nke nọ n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-gi nile, site n'onye nāwa nkú-gi rue onye nēsere miri-gi:

12. ka i we gabiga ba n'ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-gi, na n'iṅu-iyi-Ya, nke gi na Jehova, bú Chineke-gi, nāb͕a ta:

13. ka O we me ka i guzosiere Ya ike ta ibu otù ndi, ka Ya onwe-ya we buru-kwa-ra gi Chineke, dika Ọ gwara gi, na dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob.

Deuteronomi 29