19. o we rue, mb͕e ọ gānu okwu nile nke ọb͕ub͕a-iyi a, na ọ gāgọzi onwe-ya n'obi-ya, si, Udo ka m'gēnwe, ọ bu ezie na n'isi-ike nke obim ka m'nēje ije, ka m'we were iṅubiga-ihe-okè tukwasi n'akpiri-ikpọ-nku:
20. Jehova agaghi-ekwe ib͕aghara ya, kama mb͕e ahu iwe Jehova na ekworo-Ya gākwu anwuru-ọku imegide nwoke ahu, ọb͕ub͕a-iyi nile edeworo n'akwukwọ a gāmakpu kwa n'aru ya, Jehova gēhichapu kwa aha-ya n'okpuru elu-igwe.
21. Jehova gākpaputa kwa ya n'ebo nile nke Israel rue ihe ọjọ, dika ọb͕ub͕a-iyi nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke edeworo n'akwukwọ iwu a.