Deuteronomi 29:13-19 Bible Nso (IGBOB)

13. ka O we me ka i guzosiere Ya ike ta ibu otù ndi, ka Ya onwe-ya we buru-kwa-ra gi Chineke, dika Ọ gwara gi, na dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob.

14. Ọ bughi kwa nání unu ka mu onwem nāb͕a ọb͕ub͕a-ndu a na iṅu-iyi a nye;

15. kama ọ bu onye nọ n'ebe a n'etiti ayi nēguzo ta n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, ọ bu kwa onye nānọghi n'ebe a n'etiti ayi ta:

16. (n'ihi na unu onwe-unu mara otú ayi biri n'ala Ijipt; na otú ayi gabigara n'etiti mba nile nke unu gabigara agabiga;

17. unu ahuwo kwa ihe-árú nile ha, na arusi nile ha, bú osisi na nkume na ọla-ọcha na ọla-edo, nke di n'etiti ha:)

18. ka nwoke, ma-ọbu nwayi, ma-ọbu ab͕uru, ma-ọbu ebo, we ghara idi n'etiti unu, nke obi-ya nēchigharí pua ta n'ebe Jehova, bú Chineke-ayi, nọ, ije ifè chi nile nke mba ahu nile òfùfè; ka nkpọrọgwu nke nāmi ńsí na wormwood we ghara idi n'etiti unu;

19. o we rue, mb͕e ọ gānu okwu nile nke ọb͕ub͕a-iyi a, na ọ gāgọzi onwe-ya n'obi-ya, si, Udo ka m'gēnwe, ọ bu ezie na n'isi-ike nke obim ka m'nēje ije, ka m'we were iṅubiga-ihe-okè tukwasi n'akpiri-ikpọ-nku:

Deuteronomi 29