54. Nwoke nke di nro n'etiti gi, nke di kwa pekepeke nke-uku, anya-ya gājọ njọ n'aru nwa-nne-ya, na n'aru nwunye nke obi-ya, na n'aru umu-ya fọduru nke ọ kwere ka ha fọdu:
55. ọ we ghara inye onye ọ bula nime ha ufọdu nime anu-aru umu-ya nri ọ ga-eri, n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula fọduru ya; nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke onye-iro-gi nākpab͕u gi n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.
56. Nwanyi nke di nro n'etiti gi, nke di kwa pekepeke, nke nādighi-anwa iguzo ọbu-ukwu-ya n'ala n'ihi idi-pekepeke na n'ihi idi-nro, anya-ya gājọ njọ n'aru di nke obi-ya, na n'aru nwa-ya nwoke, na n'aru nwa-ya nwayi;
57. na n'aru ichi-ya nke nēsi apata ukwu-ya puta, na n'aru umu-ya nke ọ nāmu; n'ihi na ọ gēri ha na nzuzo n'ukọ ihe nile: nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke onye-iro-gi nākpab͕u gi n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.
58. Ọ buru na i lezighi anya ime okwu nile nke iwu a nke edeworo n'akwukwọ a, ka i we tua egwu aha nka nke di nsọpuru di kwa egwu, JEHOVA, bú CHINEKE-GI;
59. Jehova gēme kwa ka ihe-otiti-gi nile na ihe-otiti nile nke nkpuru-gi di ebube, ha gābu ihe-otiti uku, nke nānọgide kwa anọgide, na ọria ọjọ, nke nānọgide kwa anọgide.
60. Ọ gēme kwa ka nriaria nile nke Ijipt biaghachi n'aru gi, bu nke i turu ujọ; ha gārapara kwa n'aru gi.
61. Ọria ọ bula kwa, na ihe-otiti ọ bula, nke anēdeghi n'akwukwọ iwu a, ha ka Jehova gēme ka ha rigo n'aru gi, rue mb͕e agēkpochapu gi.
62. Unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole, n'ebe unu diri ka kpakpando elu-igwe n'uba; n'ihi na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi.
63. Ọ gēru kwa, na dika obi tọrọ Jehova utọ n'aru unu ime unu nma, na ime ka unu ba uba; otú a ka obi gātọ Jehova utọ n'aru unu ime ka unu la n'iyì, na ikpochapu unu; ewe ropu unu n'elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.
64. Jehova gēme kwa ka i b͕asa n'etiti ndi nile, site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu uwa nke-ọzọ; i gēfè kwa chi di iche iche ọzọ òfùfè n'ebe ahu, nke i nāmaghi, ma gi onwe-gi ma nna-gi-hà, bú osisi na nkume.