33. Nkpuru ala-ubi-gi na ndọb͕u-n'ọlu-gi nile ka otù ndi nke i nāmaghi gēri; ma i gābu nání onye anēmeb͕u emeb͕u na onye anāzọpia azọpia ubọchi-gi nile:
34. i we buru onye nāwi ara n'ihi ihe-ọhuhu anya-gi abua, nke i gāhu.
35. Jehova gēwere ihe-otiti ọjọ, nke anāpughi ime ka aru-gi di nma na ya, tie gi n'ikperè-ukwu-gi abua na n'ogwe-ukwu-gi abua, site n'ọbu-ukwu-gi we rue opu-n'isi-gi.
36. Jehova gēme ka gi na eze-gi, nke i gēguzo ka ọ buru eze-gi, jerue otù mba nke i nāmaghi, ma gi onwe-gi ma nna-gi-hà; i gēfè kwa chi di iche iche ọzọ n'ebe ahu, bú osisi na nkume.
37. I gāghọ kwa ihe-iju-anya, na ilu, na ihe-àkùkù, n'etiti ndi ahu nile ebe Jehova gēdu gi je.
38. I gēwere ọtutu nkpuru-ọghigha pua je n'ubi, ma ọ bu nwantī ka i gāchikọta; n'ihi na igurube gērichapu ya.
39. I gāku ubi-vine di iche iche, lu kwa ha, ma ọ dighi manya-vine i gāṅu, i gaghi-aghọ kọta kwa nkpuru-vine; n'ihi na ikpuru gēri ha.
40. I gēnwe osisi olive n'ókè-ala-gi nile, ma ọ dighi manu i gēte; n'ihi na nkpuru olive gi gādakwosi.
41. I gāmu umu-ndikom na umu-ndinyom, ma ha agaghi-abu nke gi; n'ihi na agādọta ha n'agha.
42. Osisi-gi nile na nkpuru ala-ubi-gi ka ndi ọzọ gēnweta.