2. ngọzi ndia nile gābiakwasi kwa gi, we rue gi aru, mb͕e i gēge nti olu Jehova, bú Chineke-gi.
3. Onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu n'obodo, onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu kwa n'ọhia.
4. Ihe agọziri agọzi ka ọ gābu, bú nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, na nkpuru nke anu-ulo-gi, bú umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu gi.
5. Ihe agọziri agọzi ka abọ-gi na ihe-gi iji agwọ achicha gābu.
6. Onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu na nbata-gi, onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu kwa n'ọpupu-gi.
7. Jehova gēme ka etib͕ue n'iru gi ndi-iro-gi ndi nēbili imegide gi: n'otù uzọ ka ha gāpukuru gi, ma n'uzọ asa ka ha gāb͕alaga n'iru gi.
8. Jehova gēnye ngọzi-Ya iwu n'ebe i nọ n'ọba-gi nile, na nime nseti aka-gi nile; Ọ gāgọzi kwa gi n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.
9. Jehova gēme ka i guzosiere Ya ike ibu ndi nsọ, dika Ọ ṅuru gi iyi; mb͕e i gēdebe ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, mb͕e i gēje kwa ije n'uzọ-Ya nile.