Deuteronomi 28:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ gēru kwa, ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu nke Jehova, bú Chineke-gi, ilezi anya ime ihe nile O nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, na Jehova, bú Chineke-gi, gēme gi ka i kachasia mba nile nke uwa elu:

2. ngọzi ndia nile gābiakwasi kwa gi, we rue gi aru, mb͕e i gēge nti olu Jehova, bú Chineke-gi.

3. Onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu n'obodo, onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu kwa n'ọhia.

Deuteronomi 28