7. i gāchu kwa àjà-udo, ri kwa ihe n'ebe ahu; i gāǹuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi.
8. I gēdekwasi kwa na nkume ndia okwu nile nke iwu a, agātu akika ha nke-ọma.
9. Moses na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, we gwa Israel nile okwu, si, Nọdu du, ge kwa nti, Israel; ubọchi ta ka i ghọworo Jehova, bú Chinek-gi, otù ndi.
10. I gēge kwa nti olu Jehova, bú Chineke-gi, me ihe nile O nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta.
11. Moses we nye ndi Israel iwu n'ubọchi ahu, si,
12. Ndia gēguzo n'elu ugwu Geraizim igọzi ndi Israel, mb͕e unu gabigasiri Jọdan; Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Josef, na Benjamin:
13. ndia gēguzo kwa n'ugwu Ibal bayere nkọcha; Reuben, na Gad, na Asha, na Zebulun, na Dan, na Naftali.
14. Ndi Livai gēwere olu di elu za, si ndikom nile nke Israel,