11. Moses we nye ndi Israel iwu n'ubọchi ahu, si,
12. Ndia gēguzo n'elu ugwu Geraizim igọzi ndi Israel, mb͕e unu gabigasiri Jọdan; Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Josef, na Benjamin:
13. ndia gēguzo kwa n'ugwu Ibal bayere nkọcha; Reuben, na Gad, na Asha, na Zebulun, na Dan, na Naftali.
14. Ndi Livai gēwere olu di elu za, si ndikom nile nke Israel,
15. Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēme arusi apiri api ma-ọbu arusi awuru awu, bu ihe-árú nke Jehova, ọlu aka nke onye nātu akika, we tiye ya n'ebe nzuzo. Ndi Israel nile gāza kwa, si, Amen.
16. Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēlelì nna-ya ma-ọbu nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
17. Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēwezuga ókè-ala ab͕ata-obi-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
18. Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēme onye-ìsì ka ọ jehie n'uzọ. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
19. Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēwezuga ikpé nke ọbìa, na nke nwa-nb͕ei, na nke nwayi di-ya nwuru. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
20. Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwunye nna-ya nēdina; n'ihi na o kpughewo uwe kpuchiri ọtọ nna-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
21. Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na anumanu ọ bula nēdina. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
22. Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwa-nne-ya nwayi nēdina, bú nwa-nwayi nke nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nke nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
23. Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nne-nwunye-ya nēdina. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
24. Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nētib͕u madu-ibe-ya na nzuzo. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.
25. Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nānara ihe-iri-ngo itib͕u madu, bú iwusi ọbara nke onye nēmeghi ihe ọjọ. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.