Deuteronomi 25:2-7 Bible Nso (IGBOB)

2. ọ gēru kwa, ọ buru na onye nēmebi iwu kwesiri ka etie ya ihe, na onye-ikpé gēme ka o dina ala, ka eti kwa ya ihe n'iru ya, dika nke gēzù nmebi-iwu-ya, n'ọnu-ọgugu.

3. Ọgu otiti abua ka o gēti ya, ọ gaghi-eti kari: ka ọ ghara ibu, ma asi na o gēti ya ọtutu otiti ka ndia, na agēlelì kwa nwa-nne-gi n'anya-gi.

4. Ekechila ọnu ehi mb͕e ọ nāzọcha ọka.

5. Mb͕e umu-nne ndikom gēbikọ, otù nime ha ewe nwua, ma ọ nweghi nwa-nwoke, nwunye onye ahu nke nwuru anwu agaghi-aburu nwoke ala ọzọ nwunye n'èzí: nwa-nne di-ya gābakuru ya, luru ya n'onwe-ya na nwunye, we lua ọlu kwesiri nwa-nne di n'ebe ọ nọ.

6. Ọ gēru kwa, na ọkpara ọ gāmu gānọchi n'aha nke nwa-nne-ya nke nwuru anwu, ka aghara ihichapu aha-ya n'Israel.

7. Ma ọ buru na ọ tọghi nwoke ahu iluru nwunye nwa-nne-ya na nwunye, nwunye nwa-nne-ya gārigoru ọnu-uzọ-ama, jekuru ndi-okenye, si, Nwa-nne dim nāju ime ka aha biliere nwa-nne-ya n'Israel, o kweghi ilu ọlu kwesiri nwa-nne di n'ebe m'nọ.

Deuteronomi 25