16. N'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu, bu onye ọ bula nēme ihe ndia, onye ọ bula nēme ajọ omume.
17. Cheta ihe Amalek mere gi n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta:
18. otù o zutere gi n'uzọ, tib͕ue ndi-ikpe-azu n'etiti gi, ndi nile nādighi ike n'azu gi, mb͕e gi onwe-gi nāda #mbà, mb͕e ike gwu-kwa-ra gi; ma ọ tughi egwu Chineke.
19. O gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēmewori ka i pua n'aka ndi-iro-gi buruburu, zuru ike, n'ala nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi n'ihe-nketa, ka i we nweta ya, na i gēhichapu ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe; echezọla.