Deuteronomi 25:13-18 Bible Nso (IGBOB)

13. Enwela n'àkpà-gi uzọ nkume-isì-ihe abua, nke-uku na nke-ntà.

14. Enwela n'ulo-gi uzọ ephah abua, nke-uku na nke-ntà.

15. Nkume-isì-ihe zuru okè, nke zi-kwa-ra ezi, ka i gēnwe; ephah zuru okè, nke zi-kwa-ra ezi, ka i gēnwe: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.

16. N'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu, bu onye ọ bula nēme ihe ndia, onye ọ bula nēme ajọ omume.

17. Cheta ihe Amalek mere gi n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta:

18. otù o zutere gi n'uzọ, tib͕ue ndi-ikpe-azu n'etiti gi, ndi nile nādighi ike n'azu gi, mb͕e gi onwe-gi nāda #mbà, mb͕e ike gwu-kwa-ra gi; ma ọ tughi egwu Chineke.

Deuteronomi 25