11. Mb͕e ndikom gālurita ọ̀gù, otù onye na ibe-ya, ma nwunye nke otù nime ha abiaru nso inaputa di-ya n'aka onye nēti ya ihe, asi na ọ setipu aka-ya, we jide ya na nkpa-amu-ya:
12. i gēbipu kwa aka-ya, anya-gi agaghi-eme ebere.
13. Enwela n'àkpà-gi uzọ nkume-isì-ihe abua, nke-uku na nke-ntà.
14. Enwela n'ulo-gi uzọ ephah abua, nke-uku na nke-ntà.
15. Nkume-isì-ihe zuru okè, nke zi-kwa-ra ezi, ka i gēnwe; ephah zuru okè, nke zi-kwa-ra ezi, ka i gēnwe: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.