Deuteronomi 23:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Onye emetara ọnyá site n'ichipia nkpuru-amu-ya, ma-ọbu nke ebipuru amu-ya, agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova.

2. Nwa-iko agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova; ọbuná ọb͕ọ nke-iri ya agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova.

3. Onye Amon ma-ọbu onye Moab agaghi-abà nime kpọkọta Jehova, ọbuna ọb͕ọ nke-iri ha agaghi-abà nime kpọkọta Jehova rue mb͕e ebighi-ebi:

4. n'ihi na ha ejighi achicha na miri bia n'iru unu n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta; na n'ihi na ha gotara Belam nwa Beoa imegide gi site na Petoa nke Mesọpọtemia, ikọcha gi.

5. Ma Jehova, bú Chineke-gi, ekweghi ige Belam nti; kama Jehova, bú Chineke-gi, b͕anwere nkọcha ahu ka ọ ghọrọ gi ngọzi, n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, huru gi n'anya.

6. Achọla udo-ha na ọdi-nma-ha ubọchi-gi nile rue mb͕e ebighi-ebi.

7. Akpọla onye Edom ihe árú; n'ihi na nwa-nne-gi ka ọ bu: akpọla onye Ijipt ihe-árú; n'ihi na ọbìa ka i buri n'ala-ya.

8. Umu agāmuru ha, ọb͕ọ nke-atọ ha, gābà nime nkpọkọta Jehova.

9. Mb͕e i nāpu dika ọmuma-ulo-ikwū imegide ndi-iro-gi, i gēdebe kwa onwe-gi pua n'ihe ọjọ ọ bula.

10. Mb͕e nwoke ọ bula di n'etiti unu, nke nādighi ọcha, site n'ihe mere ya n'abali, ọ gāpu kwa je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ọ gaghi-abà n'etiti ọmuma-ulo-ikwū:

11. ma ọ gēru, mb͕e ọ nēru anyasi, na ọ gēwere miri sa aru-ya: mb͕e anyanwu nāda, ọ gābà kwa n'etiti ọmuma-ulo-ikwū.

12. I gēnwe kwa otù ebe n'azu ọmuma-ulo-ikwū ebe i ganāpu je n'ọgwe:

13. i gēnwe kwa osekè n'etiti ihe-agha-gi; ọ gēru kwa, mb͕e i nānọdu n'ọgwe, na i gēwere ya gwue ala, i we chigharia kpochie ihe si n'aru-gi puta:

Deuteronomi 23