7. i ghaghi íme ka nne-nnunu la, ma umu-ya ka i gēwere n'onwe-gi; ka o we diri gi nma, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya.
8. Mb͕e i nēwu ulo ọhu, i gēme-kwa-ra elu-ulo-gi ihe-nb͕ochi buruburu, ka i ghara ime ka ọbara di n'ulo-gi, mb͕e madu gēsi na ya da.
9. Aghala uzọ nkpuru abua n'ubi-vine-gi: ka ojuju nke nkpuru i nāgha na ihe-ọmume ubi-vine-gi we ghara idi nsọ.
10. Ejikọla ehi na inyinya-ibu idọ ihe eji gwu ala-ubi.
11. Eyila uwe nke eji uzọ ihe abua kpakọta, bú aji-anu na flax n'otù.
12. I gēmere onwe-gi ihe-ogho akpara akpà n'elu usọ anọ nke ihe-nb͕okwasi-gi, bú nke i ji b͕okwasi onwe-gi.
13. Mb͕e nwoke gāluru nwunye, bakuru ya, kpọ ya asì,
14. we bo ya ebubo ihere, we weta aha ọjọ n'isi ya, si, Nwayi a ka m'luru na nwunye, m'we biarue ya nso, ma achọtaghm n'aru ya ihe nēgosi na ọ bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: