Deuteronomi 22:4-10 Bible Nso (IGBOB)

4. I gaghi-ahu inyinya-ibu nwa-nne-gi ma-ọbu ehi-ya ka ha nāda n'uzọ, we zopu onwe-gi n'ebe ha di: i ghaghi isoro ya ibuli ha elu.

5. Ihe diri nwoke agaghi-adikwasi n'aru nwayi, nwoke agaghi-eyiri kwa uwe-nb͕okwasi nwayi: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka onye ọ bula bu nke nēme ihe ndia.

6. Mb͕e akwu nnunu di n'iru gi n'uzọ, n'osisi ọ bula, ma-ọbu n'ala, umu-nnunu ma-ọbu àkwá adi kwa nime ya, nne ekpukwasi kwa umu-ya ma-ọbu àkwá-ya, ewela nne na umu-ya:

7. i ghaghi íme ka nne-nnunu la, ma umu-ya ka i gēwere n'onwe-gi; ka o we diri gi nma, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya.

8. Mb͕e i nēwu ulo ọhu, i gēme-kwa-ra elu-ulo-gi ihe-nb͕ochi buruburu, ka i ghara ime ka ọbara di n'ulo-gi, mb͕e madu gēsi na ya da.

9. Aghala uzọ nkpuru abua n'ubi-vine-gi: ka ojuju nke nkpuru i nāgha na ihe-ọmume ubi-vine-gi we ghara idi nsọ.

10. Ejikọla ehi na inyinya-ibu idọ ihe eji gwu ala-ubi.

Deuteronomi 22