18. Ndi-okenye obodo ahu gēwere nwoke ahu dọ ya aka na nti;
19. ha gēri kwa ya nra ọgu shekel ọla-ọcha ise, nye nna nke nwa-ab͕ọghọ ahu, n'ihi na o wetawo aha ọjọ n'isi nwa-ab͕ọghọ nke Israel nāmaghi nwoke: ya ka ọ gābu-kwa-ra nwunye; ọ pughi ichupu ya ubọchi-ya nile.
20. Ma ọ buru na ihe a bu, ezi-okwu, na achọtaghi n'aru nwa-ab͕ọghọ ahu ihe nēgosi na ọ bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke:
21. ha gēme kwa ka nwa-ab͕ọghọ ahu putarue ọnu-uzọ ulo nna-ya, ndikom obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya ka ọ we nwua: n'ihi na o mere ihe-nzuzu n'Israel, ikwa iko n'ulo nna-ya: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.
22. Mb͕e agāhuta nwoke ka ya na nwayi nēdina, bú nwayi nke di lutaworo, ha abua gānwu kwa, bú nwoke ahu nke ya na nwayi ahu nēdina, na nwayi ahu: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'Israel.
23. Mb͕e nwa-ab͕ọghọ di nke bu nwayi nāmaghi nwoke, nke nwoke kwere ilu, ma nwoke hutara ya n'obodo, we soro ya dina;
24. unu gēme kwa ka ha abua putarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, unu gēwere nkume tub͕ue ha, ka ha we nwua; nwa-ab͕ọghọ ahu, n'ihi na o tighi nkpu n'obodo: na nwoke ahu, n'ihi na o wedawo nwunye madu-ibe-ya n'ala: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.