10. Ejikọla ehi na inyinya-ibu idọ ihe eji gwu ala-ubi.
11. Eyila uwe nke eji uzọ ihe abua kpakọta, bú aji-anu na flax n'otù.
12. I gēmere onwe-gi ihe-ogho akpara akpà n'elu usọ anọ nke ihe-nb͕okwasi-gi, bú nke i ji b͕okwasi onwe-gi.
13. Mb͕e nwoke gāluru nwunye, bakuru ya, kpọ ya asì,
14. we bo ya ebubo ihere, we weta aha ọjọ n'isi ya, si, Nwayi a ka m'luru na nwunye, m'we biarue ya nso, ma achọtaghm n'aru ya ihe nēgosi na ọ bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke:
15. nna nwa-ab͕ọghọ ahu, na nne-ya, gēwere kwa ihe nēgosi na nwa-ab͕ọghọ ahu bu onye nāmaghi nwoke, ha gēweputa-kwa-ra ha ndi-okenye obodo, rue ọnu-uzọ-ama:
16. nna nwa-ab͕ọghọ ahu gāsi kwa ndi-okenye ahu, Nwam nwayi ka m'nyere nwoke a na nwunye, o we kpọ ya asì;
17. ma, le, nwoke a ebowo ya ebubo ihere, si, Achọtaghm n'aru nwa-gi nwayi ihe nēgosi na ọ bu nwayi nāmaghi nwoke; ma ndia bu ihe nēgosi na nwam nwayi bu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ha gāb͕asa kwa uwe-nb͕okwasi-ya n'iru ndi-okenye obodo ahu.