1. I gaghi-ahu ehi nwa-nne-gi, ma-ọbu aturu-ya, nke nāchọ ifu efu, we zopu onwe-gi n'ebe ha di: i ghaghi iwere ha nyeghachi nwa-nne-gi.
2. Ma ọ buru na nwa-nne-gi anọghi gi nso, ọ buru kwa na i maghi ya, i gēwebata kwa ya n'etiti ulo-gi, ọ gādi kwa n'aka-gi rue mb͕e nwa-nne-gi gāju ase ya, i we were ya nyeghachi ya.
3. Otú a ka i gēme-kwa-ra inyinya-ibu-ya; otú a ka i gēme-kwa-ra uwe-nb͕okwasi-ya; otú a ka i gēme-kwa-ra ihe ọ bula furu efu nke nwa-nne-gi, nke nēfunari ya, ma i hutawo ya: i pughi izo onwe-gi.
4. I gaghi-ahu inyinya-ibu nwa-nne-gi ma-ọbu ehi-ya ka ha nāda n'uzọ, we zopu onwe-gi n'ebe ha di: i ghaghi isoro ya ibuli ha elu.
5. Ihe diri nwoke agaghi-adikwasi n'aru nwayi, nwoke agaghi-eyiri kwa uwe-nb͕okwasi nwayi: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka onye ọ bula bu nke nēme ihe ndia.
6. Mb͕e akwu nnunu di n'iru gi n'uzọ, n'osisi ọ bula, ma-ọbu n'ala, umu-nnunu ma-ọbu àkwá adi kwa nime ya, nne ekpukwasi kwa umu-ya ma-ọbu àkwá-ya, ewela nne na umu-ya:
7. i ghaghi íme ka nne-nnunu la, ma umu-ya ka i gēwere n'onwe-gi; ka o we diri gi nma, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya.
8. Mb͕e i nēwu ulo ọhu, i gēme-kwa-ra elu-ulo-gi ihe-nb͕ochi buruburu, ka i ghara ime ka ọbara di n'ulo-gi, mb͕e madu gēsi na ya da.
9. Aghala uzọ nkpuru abua n'ubi-vine-gi: ka ojuju nke nkpuru i nāgha na ihe-ọmume ubi-vine-gi we ghara idi nsọ.