4. n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, bu onye nēso unu je, iburu unu agha megide ndi-iro-unu, ka O we zọputa unu.
5. Ndi-ọchi-agha gāgwa ndi Israel okwu, si, Ònye bu nwoke nke wuworo ulo ọhu, ma ọ kāraghi ya nye Chineke? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe ra ya nye Chineke.
6. Ònye bu kwa nwoke nke kuworo ubi-vine, ma ọ kēmeghi ka ọ pua na nsọ anāsọ ya? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe me ka ọ pua na nsọ anāsọ ya.
7. Ònye bu kwa nwoke nke kwere ilu nwayi, ma o kēkubataghi ya? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe kubata ya.
8. Ndi-ọchi-agha gāgwa kwa ndi Israel okwu ọzọ, si, Ònye bu nwoke nke nātu egwu, nke obi nālọ kwa ya miri? ya je laghachi n'ulo-ya, ka obi umu-nne-ya we ghara imebi dika obi-ya.