7. N'ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I gākpaputara onwe-gi obodo atọ.
8. Ọ buru kwa na Jehova, bú Chineke-gi, eme ókè-ala-gi ka ọ sa mbara, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi, O we nye gi ala ahu nile nke O kwuru, si na Ọ gēnye nna-gi-hà;
9. mb͕e i gēdebe ihe nile a enyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ime ya, ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ije ije n'uzọ-Ya nile ubọchi-gi nile; i gātukwasi-kwa-ra onwe-gi obodo atọ ọzọ n'obodo atọ ndia:
10. ka ewe ghara iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'etiti ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa, ọbara we dikwasi gi n'isi.