19. unu gēme kwa ya, dika o zubere ime nwa-nne-ya; i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.
20. Ndi fọduru gānu kwa, tu kwa egwu, ha agaghi-eme kwa dika ihe ọjọ a si di ọzọ n'etiti gi.
21. Anya-gi agaghi-eme ebere; ndu lara ndu, anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu.