3. Nka bu kwa ihe ekpeziri ka enye ndi-nchu-àjà site n'aka ndi Israel, bú site n'aka ndi nāchu àjà, ma ọ bu ehi-ma-ọbu aturu, na ha gēnye onye-nchu-àjà ọkwa-aka-ya, na ǹtì-ya abua, na okwurù-ya.
4. Ihe mbu nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na ihe mbu nke aji ìgwè ewu na aturu-gi, ka i gēnye ya.
5. N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, arọputawo ya n'ebo-gi nile, iguzo ije ozi n'aha Jehova, ya onwe-ya na umu-ya ndikom ubọchi-gi nile.
6. Mb͕e onye Livai gābia site n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile site n'Israel nile, ebe ya onwe-ya nọ dika ọbìa, ọ we were agu nile nāgu nkpuru-obi-ya biarue ebe ahu nke Jehova gārọputa;
7. ọ gēje kwa ozi n'aha Jehova, bú Chineke-ya, dika umu-nne-ya nile, bú ndi Livai, ndi nēguzo n'ebe ahu n'iru Jehova.