Deuteronomi 18:12-18 Bible Nso (IGBOB)

12. N'ihi na ihe-árú nke Jehova ka onye ọ bula nke nēme ihe ndia bu: ọ bu kwa n'ihi ihe-árú ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n'iru gi.

13. Onye zuru okè ka i gābu n'ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ.

14. N'ihi na mba ndia, nke gi onwe-gi gēnweta, nēge nti ndi nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, na ndi nāju ase: ma gi onwe-gi, ọ bughi otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.

15. Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka onye-amuma, nke di ka mu onwem, biliere gi site n'etiti gi, site n'umu-nne-gi; onye ahu ka unu gēge nti;

16. dika ihe nile si di nke i riọrọ n'aka Jehova, bú Chineke-gi, na Horeb n'ubọchi nkpọkọta ahu, si, Ka m'ghara inu kwa olu Jehova, bú Chinekem, ọzọ, ka m'ghara kwa ihu ọku uku a ọzọ, ka m'we ghara inwu.

17. Jehova we sim, Ha ekwuwo nke-ọma okwu nke ha kwuworo.

18. M'gēme ka onye-amuma, nke di ka gi, biliere ha site n'etiti umu-nne-ha; M'gētiye kwa okwum nile n'ọnu-ya, ọ gāgwa kwa ha okwu nile nke M'gēnye ya n'iwu.

Deuteronomi 18