1. N'ọgwugwu arọ asa i gēme nrapu.
2. Nka bu kwa okwu nrapu ahu: onye-nbinye ọ bula gārapu ihe nke o nēbinye ab͕ata-obi-ya; ọ gaghi-eji ab͕ata-obi-ya na nwa-nne-ya n'ihe-ike; n'ihi na akpọsara nrapu nye Jehova.
3. Onye ala ọzọ ka i gēji n'ihe-ike: ma ihe ọ bula i nwere nke di n'aka nwa-nne-gi, aka-gi gārapu ya;