10. Ma mb͕e unu gabigara Jọdan, biri n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēme ka unu keta, mb͕e O mesi-kwa-ra ka unu zuru ike pua n'aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi;
11. ọ gēru kwa, na ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, n'ebe ahu ka unu gēwebata ihe nile m'nēnye unu n'iwu; àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa-unu nile arọputara arọputa nke unu nēkwe Jehova:
12. unu gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, unu onwe-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na orù-unu ndikom, na orù-unu ndinyom, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-unu ọ bula; n'ihi na o soghi unu nwe òkè ma-ọbu ihe-nketa.