Deuteronomi 11:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. I gāhu kwa Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, debe ihe-ndebe-Ya, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, na ihe nile Ọ nyere n'iwu, ubọchi-gi nile.

2. Ma unu amawo ta: n'ihi na ọ bughi umu-unu ka m'nāgwa okwu, bú ndi nāmaghi, ndi nāhughi kwa idọ-aka-na-nti nke Jehova, bú Chineke-unu, na idi-uku-Ya, na aka-Ya di ike, na ogwe-aka-Ya esetiri eseti,

3. na ihe-iriba-ama-Ya nile, na omume-Ya nile, nke Ọ mere Fero eze Ijipt, me kwa ala-ya nile, n'etiti Ijipt;

4. na ihe O mere usu-ndi-agha Ijipt, me kwa inyinya-ha, me kwa ub͕ọ-ala-ha; mb͕e O mere ka miri Oké Osimiri Uhie rukpuchie iru-ha mb͕e ha nāchu unu n'azu, Jehova we me ka ha la n'iyì rue ta;

5. na ihe O mere unu n'ọzara, rue mb͕e unu biaruru ebe a;

6. na ihe O mere Detan na Abairam, umu Eliab, nwa Reuben; mb͕e ala saghepuru ọnu-ya, loda ha, na ezi-na-ulo nile ha, na ulo-ikwū nile ha, na ihe ọ bula di ndu nke di n'ukwu-ha, n'etiti Israel nile:

7. ma ọ bu anya-unu nāhu omume uku nile nke Jehova, nke O meworo.

8. Unu gēdebe kwa ihe nile enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka unu we di ike, ba nime, nweta ala ahu, ebe unu onwe-unu nāgabiga inweta ya;

9. ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha, inye kwa nkpuru-ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù erù nime ya.

10. N'ihi na ala ahu, ebe gi onwe-gi nābà nime inweta ya, ọ bughi dika ala Ijipt ka ọ bu, ebe unu si puta, ebe i nāgha nkpuru-gi, were ukwu-gi nāb͕a ya miri, dika akwukwọ nri ubi ab͕ara ogige:

11. ma ala ahu, ebe unu nāgabiga inweta ya, bu ala ugwu na ndagwurugwu; site na miri-ozuzo nke elu-igwe ka ọ nāṅu miri:

12. ọ bu ala nke di Jehova, bú Chineke-gi, n'obi; mb͕e nile ka anya Jehova, bú Chineke-gi, nādikwasi ya, site na mb͕e mbu nke arọ we rue mb͕e ikpe-azu nke arọ.

13. O gēru kwa, ọ buru na unu ejisie ike ige nti ihem nile enyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè,

Deuteronomi 11