20. Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; Ya ka i gēfè, Ya ka i gārapara n'aru, aha-Ya ka i gēji ṅu iyi.
21. Ya Onwe-ya bu otuto-gi, Ya Onwe-ya bu kwa Chineke-gi, Onye meworo gi ihe uku ndia di egwu, nke anya-gi huworo.
22. Ọ bu ọgu madu atọ na iri ka nna-gi-hà ji rida n'Ijipt; ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-gi, emewo gi ka i di ka kpakpando elu-igwe n'uba.