35. Ọ dighi otù nwoke nime ndikom ndia nke ọb͕ọ ọjọ nka gāhu ezi ala ahu ma-ọli, bú ala nke M'ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha,
36. ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, ya onwe-ya gāhu ya; ọ bu ya ka M'gēnye ala ahu nke ọ zọkwasiri ukwu, M'gēnye kwa umu-ya: n'ihi na o sozuwo Jehova n'azu
37. Ọ bu kwa mu ka Jehova wesara iwe n'ihi unu, si, Gi onwe-gi kwa, i gaghi-abà n'ebe ahu:
38. Joshua nwa Nun, nke nēguzo n'iru gi, ya onwe-ya gābà n'ebe ahu: gi me ya ka ọ di ike; n'ihi na ya onwe-ya gēme ka Israel keta ya.