Daniel 9:26-27 Bible Nso (IGBOB)

26. Ma mb͕e ọgu ízù atọ na abua ahu gasiri agēbipu onye etere manu, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe: ọ bu kwa obodo ahu na ebe nsọ ahu ka ndi nke otù onye-ndú nke gaje ibia gēbibi; ma ọgwugwu-ya gādi na nrubiga-ókè dika nke miri, ọ bu kwa rue ọgwugwu mb͕e ahu ka agha gādi; ihe akara àkà bu itọb͕ọrọ-n'efu di iche iche.

27. Ọ gēme kwa ka otù ọb͕ub͕a-ndu siere ọtutu madu ike otù ízù: ọ bu kwa na nkera ízù ahu ka ọ gēme ka àjà na onyinye-inata-iru-ọma kwusi; ọ bu kwa n'elu nkù ihe-árú di iche iche ka otù onye nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu gābia: ọ bu kwa rue mb͕e agāwukwasi ngwusi na ihe akara àkà n'aru onye ahu nākpata itọb͕ọrọ-n'efu.

Daniel 9