Daniel 8:17-27 Bible Nso (IGBOB)

17. O we bia nso n'ebe m'nēguzo; ma mb͕e ọ biara, m'we tua egwu nke-uku, da kpue irum n'ala: o we sim, Ghọta, gi nwa nke madu; n'ihi na mb͕e nke ọgwugwu ihe nile ka ọhù a diri.

18. Mb͕e ọ kpayerem uka, m'we di n'oké ura da kpue irum n'ala: o we metum aka, me ka m'guzo ọtọ n'ebe m'nēguzo.

19. O we si, Le, m'gaje ime ka i mara ihe ahu nke gādi n'ikpe-azu nke oké iwe a: n'ihi na ọ diri mb͕e akara àkà nke ọgwugwu ihe nile.

20. Ebulu ahu nke i huru, nke nwere mpi abua, ha bu eze nke Midia na Peasia.

21. Nkpi ahu nke nwere aji ri nne bu eze Jevan: ma mpi uku ahu nke di n'etiti anya-ya abua, nke ahu bu eze mbu.

22. Ma mpi ahu, nke b͕ajiri ab͕aji, nke mpi anọ guzoro n'ọnọdu-ya, ala-eze anọ gēsi na mba ahu guzo, ma ọ bughi n'ike-ya.

23. Ma na mb͕e ikpe-azu nke ala-eze-ha, mb͕e ndi-njehie gējehiezuwori, otù eze gēguzo ọtọ, nke nwere iru di ike, ọ bu kwa onye nāghọta okwu-omimi di iche iche.

24. Ike-ya gēsi kwa ike, ma ọ bughi n'ike nke aka ya; ọ gēbibi kwa n'uzọ di ebube, ihe gāga-kwa-ra ya nke-ọma, ọ gēme kwa ihe: ọ gēbibi kwa ndi nwere ume na ndi ahu, bú ndi nsọ.

25. Ọ gēsite kwa n'ezi uche-ya me ka aghughọ ga nke-ọma n'aka-ya; ọ bu kwa n'obi-ya ka ọ gēme onwe-ya uku; ọ bu kwa na mb͕e udo-ha ka ọ gēbibi ọtutu madu: ọ bu kwa imegide onye-isi nke ndi-isi ka ọ gēguzo; ma agāb͕aji ya nējighi aka.

26. Ma ọhù ahu nke anyasi na ututu nke ekwuworo, ezi-okwu ka ọ bu: ma gi onwe-gi zobe ọhù ahu; n'ihi na ọ diri ọtutu ubọchi di n'iru.

27. Ma mu onwem, bú Daniel, ike gwurum, m'we ria ọria ubọchi ufọdu; m'we bilie, je ozi eze: ọhù ahu ju-kwa-ram anya, ma ọ dighi onye nāghọta ya.

Daniel 8