Daniel 8:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. N'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze nke Belshaza, bú eze, emere ka m'hu ọhù, bú mu onwem Daniel, mb͕e ọhù ahu nke emere ka m'hu ya n'isi-nmalite gasiri.

2. M'we hu n'ọhù ahu; o we rue, mb͕e m'nāhu, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze nke di n'Ilam, bú ala anāchi achi; m'we hu n'ọhù ahu, ma le, mu onwem nọ n'akuku osimiri Ulai.

3. M'we welie anyam, hu, ma, le, otù ebulu nēguzo n'iru osimiri ahu nke nwere mpi abua: mpi abua ahu di kwa elu, ma otù di elu kari ibe-ya: ma nke ka elu kpe azu pute.

4. Ahurum ebulu ahu ka ọ nāsọ mpi n'akuku Ọdida-anyanwu, na n'akuku Ugwu, na n'akuku Ndida; ma ọ dighi anu ọ bula nēguzo n'iru ya, ọ dighi kwa onye nānaputa ihe n'aka-ya; ma ọ neme dika ọ tọrọ ya utọ, me onwe-ya uku.

5. Ma mu onwem nọ nāchighari uchem, ma, le, otù nkpi siri n'Ọdida-anyanwu bia n'elu uwa nile, ma ọ dighi-emetu ala ma-ọli: nkpi ahu nwe-kwa-ra mpi juru anya n'olile n'etiti anya-ya abua.

6. O we biakute ebulu ahu nke nwere mpi abua, nke m'huru ka ọ nēguzo n'iru osimiri ahu, o we b͕akwasi ya ọsọ n'ọnuma nke ike-ya.

7. M'we hu ya ka ọ nābiarutu ebulu ahu nso, o we wesa ya iwe di ilu, tib͕ue ebulu ahu, sọjie mpi-ya abua; ike adighi kwa ebulu ahu iguzo n'iru ya, o we tuda ya n'ala, zọda ya ukwu; ọ dighi kwa onye nānaputa ebulu n'aka-ya.

8. Nkpi ahu we me onwe-ya uku ri nne: ma mb͕e o nwere ume, ab͕ajiri mpi uku ya; mpi anọ nke juru anya n'olile we pute n'ọnọdu ya chere iru n'ifufe anọ nke elu-igwe.

9. Ma otù nime ha ka otù mpi ntà siri puta, o we dikarisiri uku, n'uzọ Ndida, na n'uzọ Ọwuwa-anyanwu, na n'uzọ ala ahu mara nma.

10. O we di uku rue usu ihe nile nke elu-igwe; o we me ka ufọdu nime usu ihe nile nke elu-igwe na nime kpakpando da n'ala, o we zọda ha ukwu.

11. Ọbuná rue Onye-isi nke usu ahu ka o mere onwe-ya uku;ọ bu kwa n'aka-Ya ka ọ napuru àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, atuba-kwa-ra ọnọdu nke ebe nsọ Ya.

Daniel 8