1. N'arọ mbu nke Belshaza, bú eze Babilon, Daniel huru nrọ na ọhù di iche iche nke isi-ya n'elu ihe-ndina-ya: mb͕e ahu nrọ ahu ka o dere n'akwukwọ, ọ bu isi ihe n'ihe nile ọ huru ka o kwuru.
2. Daniel zara, si, Anọm nāhu n'ọhùm n'abali, ma, le, ifufe anọ nke elu-igwe nēfekwasi oké osimiri uku si-ike.
3. Anu anọ nke di uku we nēsi n'oké osimiri rigoputa, ha di iche otù n'ibe-ya.