Daniel 6:14-24 Bible Nso (IGBOB)

14. Mb͕e ahu eze, mb͕e ọ nuru okwu a, ọ jọrọ njọ n'anya-ya nke-uku, ọ bu kwa Daniel ka ọ tukwasiri obi-ya idọputa ya: we rue ọdida anyanwu ka ọ nọ nējisi ike inaputa ya.

15. Mb͕e ahu ndikom ndia were oké nkpọtu b͕akọta n'ebe eze nọ, ha we si eze, Mara, gi eze, na iwu nke diri Midia na Peasia bu, na ọ dighi isọ-nsọ ọ bula ma-ọbu ukpuru ọ bula nke eze nēme ka o guzosie ike agāb͕anwe.

16. Mb͕e ahu eze kwuru, ha we me ka Daniel bia, ha we tubà ya n'olùlù ọdum. Eze zara, si Daniel, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ya onwe-ya gādọputa gi.

17. Ewe bute otù nkume, tukwasi ya n'ọnu olùlù ahu; eze we were nb͕a-aka-akàrà-ya na nb͕a-aka-akàrà ndi-isi-ya ka ya; ka ewe ghara ib͕anwe ihe ezubere bayere Daniel.

18. Mb͕e ahu eze lara n'ulo uku ya, nọ ọnọdu-abali nēbu ọnu: achibatakwaghi ubọ egwú n'iru ya: ura-ya fepu-kwa-ra n'anya-ya.

19. Mb͕e ahu eze biliri n'isi-ututu, mb͕e chi bọrọ, o we were ọsọ garue olùlù ọdum.

20. Mb͕e ọ nābiaru nso olùlù ahu n'ijekuru Daniel, ọ bu olu dika nke onye ihe nēwuta ka o jiri ti nkpu: eze zara, si Daniel, Daniel, gi orù nke Chineke di ndu, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ọ̀ puru idọputa gi n'aka ọdum?

21. Mb͕e ahu Daniel gwara eze okwu, si, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

22. Chinekem ezitewo mọ-ozi-Ya, we kpuchita ọnu ọdum ndia, ha emerughkwam aru: n'ihi na n'iru Ya ọ bu emeghi-ihe-ọjọ ka ahuru nimem; ọzọ kwa, n'iru gi, eze, ọ dighi ihe-imeru-aru m'meworo.

23. Mb͕e ahu ọ di eze nma n'anya nke-uku, o we si ka ha me ka Daniel rigoputa n'olùlù ahu. Ewe me ka Daniel si n'olùlù ahu rigota, ọ dighi kwa imeru-aru ọ bula ahuru n'aru-ya, n'ihi na ọ tukwasiri Chineke-ya obi.

24. Eze we kwue, ha we me ka ndikom ahu bia, bú ndi borori Daniel ebubo, ọ bu kwa n'olùlù ọdum ka ha tubàra ha na umu-ha na ndi bu nwunye-ha; ha akēruteghi kwa ala olùlù ahu tutu ọdum enwe ike n'aru ha, tapia ọkpukpu-ha nile.

Daniel 6