10. Ma Daniel, mb͕e ọ mara na akayewo aha n'ihe ahu edere n'akwukwọ, o we bata n'ulo-ya: (ma o nwere window ufọdu ghere oghe n'ime-ulo-elu-ya chere iru na Jerusalem;) ọ bu kwa ub͕ò atọ n'ubọchi ka ya onwe-ya nēb͕u ikperè-ya n'ala nēkpe ekpere, nēkele ekele n'iru Chineke-ya, n'ihi na otú a ka ọ nēmeri site na mb͕e gara aga.
11. Mb͕e ahu ndikom ndia were oké nkpọtu b͕akọta, chọputa Daniel ka ọ nāriọ aririọ, nāriọ kwa aririọ-amara n'iru Chineke-ya.
12. Mb͕e ahu ha biaruru nso, kwue okwu n'iru eze bayere isọ-nsọ eze, si: Ọ̀ dighi isọ-nsọ i kayere aha, na onye ọ bula nke gāriọ chi ọ bula ma-ọbu madu ọ bula aririọ rue orú ubọchi na iri, ma-ọbughi nání gi, eze, na agātubà ya n'olùlù ọdum? Eze zara, si, Ihe nke nēguzosi ike ka ihe a bu, dika iwu Midia na Peasia si di, nke nādighi-agabiga.
13. Mb͕e ahu ha zara, si n'iru eze, Daniel, onye bu otù nime umu ndi Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ọ nughi olu-gi, eze, ma-ọbu isọ-nsọ ahu nke i kayeworo aha-gi, kama ub͕ò atọ n'ubọchi ka ọ nāriọ aririọ-ya.